Search:

Ajụjụ ndị anajụ oge niile

Anyị naghota na ikekwe ọbụghị ajụjụ niile inwere ịjụ ka azara. N’ihi ya nkea bụ ajụjụ niile ndi ibe gị debatara akwụkwọ jụrụ n’oge gara-aga. Ọ bụrụ na-aziza gị adịghị n’ebea, n’ekwentị ọbụrụ na inwere ajujụ ndi ọzọ, biko kpọtụrụ anyị na clerk@christianscience.com (n’asụsụ Igbo) m’ọbụ kpọ anyị n’ekwentị na +1 617 450 3481 (n’asụsụ Bekee, French, Germani na Spanish)

Ole mgbe ana-anabata ndi ọhụ?

Ana-anabata ndi ọhụ na ngwụcha nke ọnwa Mee m’ọbụ mmalite nke ọnwa June na mmalite nke ọnwa Nọvemba na nzukọ nke ndi Kristen Sayensi Bod ndi Direktọ (Christian Science Board of Directors). Ma ana-anabata akwụkwọ edetara n’ime afọ niile!

Ole oge ọdi mkpa unu ga-anata akwụkwọ m detara maka itule ya iji nabata m n’oge ọzọ ana-anabata mmadụ?

Ndi Kristen Sayensi Bod nke Direktọ ga-atule akwụkwọ niile edetara na abalị iri atọ na otu n’ọnwa Mee, n’arọ 2024. Akwụkwọ niile edechara nke ọma kwesịrị ịrute Ụlọ ọrụ nke Ode akwụkwọ tupu ọkụọ elekere anọ, n’oge nke Boston, ọnwa Mee iri abụọ na itoolu.

Ènwèrèm ike bịanye akam n’akwụkwo m debatara n’Ígwè kọmpụta?

É è, mbinye aka niile (nke gị, nke onye na-akwado gị, na Onye nke abụọ binyere aka ya n’akwụkwọ gị, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa) gabụrịrị ihe eji aka dee.

Ole ebe m ga-eziga akwụkwọ m detara nke mjiri mpe mpe akwụkwọ pụrụ iche de?

Ana eziga akwụkwọ edetara ịbụ onye ọgbakọ na:

The First Church of Christ, Scientist 
Clerk, Membership Applications P06-10
210 Massachusetts Avenue
Boston, MA 02115-3195
U.S.A.

I ga-ahụ ebe ana-edeta akwụkwọ na mgbada nke ntupe nke abụa nke ideta akwụkwọ. 

Gini geme ma m zigasia akwụkwọ m detara nye Ode akwụkwọ?

Mgbe ọbụla anatara akwụkwọ idetara ma tulesia ya n’ụlọ ọrụ Ode akwụkwọ, anyị ga-edetara gị akwụkwọ ime ka ịmata na anyị anatawo ya, m’ọbụ kwanụ me ka ịmata ma ọdị ihe banyere gị anyị chọrọ ka ịgwakwuo anyị.

Ana-edeta akwụkwọ ịbụ onye agbako n’asụsụ ọzọ di iche iche?

E! Ana-edeta akwụkwọ ịbụ onye agbakọ n’asụsụ Bekee (English)Čeština (Czech), Danish (Dansk), German (Deutsch), Spanish (Español), French (Français)Indonesian (Bahasa Indonesia), Italian (Italiano), Japanese (日本語), Dutch (Nederlands)Polish (Polski), Potokiri (Português), Russian (Pусский), Finnish (Suomi), Swedish (Svenska) na Grik (λληνικά).

Maka ịnata akwụkwọ n’asusu Czech m’ọbụ Norwegian, biko kpọtụrụ clerk@christianscience.com.

Enwere m ike ịnweta akwụkwọ site na postal mail?

Ee! Naanị zitere anyị email na clerk@christianscience.com maọbụ kpọọ anyị n'ekwentị +1 617 450 3481, anyị ga-ezitere gị ihe ị chọrọ.

M’nwere ike izite akwụkwọ ịbụ onye agbakọ nkem dejuru nkeọma site na email?

E! Anyị pụrụ ịnata akwụkwọ ịbụ onye ọgbakọ edere aha na ya dịka ihe agbakwụnyere na email edegara na clerk@christianscience.com. Etụ ọ dị, mbinye aka niile (nke gị, ndị na-akwado gị, na nke onye na-edebanye aha gị, ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa) ga-abụ nke ejiri aka dee. Ihe ọpụtara bụ na ọdị mkpa ka ebịanye aka na mpe mpe akwụkwọ gị, a scana ya tupu ezitere anyị ya dịka email.

Ezitere m akwụkwọ ịbụ onye ọgbakọ... ma anụbeghị m ihe banyere ya site n’ọnụ unu?

Anyị nagbalị ị nata akwụwọ edetara ịbụ onye ọgbakọ ọsọsọ. Etu ọdị, ọbụrụ na ọkariwo otu ọnwa idetara anyị akwụkwọ ịbụ onye ọgbakọ ma onwebeghị ihe anyị gwara gị, biko kpọtụrụ anyị na clerk@christianscience.com

Ole mgbe m gachọpụta na anabatawom?

Ị ga-achọpụta ụbọchị ndi Kristen Sayensi Bod nke Direktọ neme ntuli aka ịnabata ndi detara akwụkwọ ịbụ ndi ọgbakọ. Ọ bụrụ na-emewo ntuliaka ma nabata gị ịbụ onye ọgbakọ, ị ga-anata email nke gụnyere leta eji nabata gị, nke apụkwara izitere gi dika leta. Ọ bụrụ na emeghi ntuli aka  ịnabata gị ịbụ onye ọgbakọ, anyị ga-emekwa ka ịmara nkea. (Lee Manual of The Mother Church [Akwụkwọ ntuziaka nke The Mother Church] 37:7.)

Onwere ike ịbụ na-abụrụwom onye ọgbakọ... ma odoghị m anya. Ele etu mgesi achọputa?

Anyị pụrụ inyere gị aka! Biko kpọtụrụ clerk@christianscience.com.

Anam abịaghachi na Chọọchị ịbụ onye ọgbakọ. Gịnị ka m’kwesịrị itule?

Biko ga leele ịhe edere banyere ndi nabiaghachi ọzọ ịbụ onye ọgbakọ.

Arịọrọm arịrịọ ka m’kwado onye detara akwụkwọ. Gịnị ka nkea pụtara?

Dika onye nkwado, ọdị mkpa ka ịbụrụ onye ọgbakọ nke The Mother Church

ma nwe ike ịgba aka ebe banyere onye ahụ detara akwụkwọ dịka onye nogidesiri-ike n’ozizi Kristen Sayensi. Site n’itinye aha gị n’akwụkwọ ahụ nke odere, ịna-ekwu n’ọbụ eziokwu na onye ahụ detara akwụkwọ kwusịrị-ike na Kristen Sayensi, na ha abụghị ndi otu nke okpukperechi ọzọ, na inyochawo akwụkwọ ahụ edere nkeọma we chọputa na edere ya etu ekwesiri iji dee ya. Onwekwara ike inwe oge Ụlọ ọru Ode akwụkwọ ga-akpọ gị ka ịgwakwuo ha ihe banyere onye ahụ nke detara akwụkwọ.

Onye nke abụa nke n’ebịnye aka ya n’akwụkwọ ahụ kwesiri idenye aha ya. Gịnị ka nkea pụtara?

Onye nke abụa nke netinye aha ya n’akwụkwọ bụ onye nkuzi nke Kristen Sayensi (C.S.B.). Ọ bụrụ na onye nkwado ahụ abụghị onye nkuzi Kristen Sayensi, ọdị mkpa ka ha zigara onye nkuzi akwụkwọ ahụ ka obinye aka ya. Onye nke abụa nke nebinye aka ya n’ekwu na ya mara onye nke mbụ nkeọma, onye ahụ buru ụzọ binye aka ya, ọdịghị kwa mkpa ka ọ maara onye ahụ detara akwụkwọ. Onye nke abụa ahụ nke debara aha ya n’akwụkwọ ahụ ga-eziga ya dịka leta m’ọbụ scana ya ma zipu ya dịka email nye ode akwụkwọ nke The Mother Church.

Kedu ka mgeji akwụ ụtụ isim?

Biko ga leele ebe anyị dere ihe banyere ụtụ isi – “per capita tax” (n’asụsụ Bekee).