Search:

Me Kristen Sayensi lekchọ

Ime lekchọ bụ ihe nkpalite uche buru kwa ihe ọgwụgwọ ọrịa nye nmadụ nile nkea metụtara. Na mgbada enwere ọtụtụ ihe eji alụ-olụ, ọtụtụ ihe edere nke n’enye aka, na ọtụtụ echiche echepụtara nke alaka chọọchị m’ọbụ sosaiti gị ga atule dịka unu nejikere ime lekchọ.


Tupu amalite ime lekchọ, ọ ga enyeaka itule iwu ndi ahụ dị na Manual of The Mother Church [Chọọchị Manual] nke ejiri hiwe lekchọ Kristen Sayensi. Ebea edepụtara ihe abụa sitere na ya;

Atịkụl XXXII

Lekchọ nke nadị kwa afọ. Agba nke 4. The Mother Church na alaka ya nile ga n’akpọku Bọd nke nahụ maka lekchọ arọ ọbụla ka ewe mere ha lekchọ otu ugboro m’ọbụ karia (Chọọchị Manual 5:16).

Atịkụl XXXI

Ọlụ ndi neme lekchọ kwesirị ịlụ. Agba nke 2. Ọbụ ọlụ dịrị ndi Bọd nahụ maka lekchọ itinye ọsisa bụ eziokwu nke zikwara ezi banyere nkatọ nke ọra mmadụ na akatọ Kristen Sayensi ma gba ezi ama nke bụ eziokwu banyere ndụ nke onye ụkọchukwu anyị (Chọọchị Manual 93:10-15).

Arapụ kwala ịgụ edemede abụa ndi edere nso-nsoa gbasara lekchọ Kristen Sayensi nke ebipụtara na The Christian Science Journal, bipụtakwa na The Herald of Christian Science.


Etu esi ede akwụkwọ ka emere gị lekchọ

  1. Chọ onye geme lekchọ ahụ. Dee akwụkwọ nye ndi nahụ maka lekchọ ka iwe mara aha ndi arọpụtara ime lekchọ n’oge ndia.

  2. Gị na onye neme lekchọ onye ịhọrọ nwe nkwekọrịta ka ịmara ma onwere ohere, tupu izupu fọm nke iji chọ ka emere gị lekchọ.

  3. Izupu akwụkwọ fọm maka lekchọ negosi na Executive Bọd nke chọọchị gị ekwerewọ ime lekchọ ahụ ha na onye gaje ikwu okwu.

  4. Dejuo fọm ahụ nke iji chọ ka emere gị lekchọ on-line, inwere ike idepụta ya n’asụsụ nke gị onwe gị, nagbanyeghị na edere fọm ahụ n’okwu Bekee. Ọ buru na ọ rara gị ahụ ideju fọm a on-line, enwere faịlụ PDF n’asụsụ Bekee, French, German, Italian, Portuguese m’ọbụ Spanish nke ị ga edeju ma zitere anyị. Zibata otu fọm maka otu lekchọ (ma ọbụrụ na I neme karia otu lekchọ).

Ọburu na inwere ajụjụ, m’ọbụ na ị chọrọ enyemaka, biko ziga ozi n’isi ụlọ ọrụ ndi Bọd nahụ maka lekchọ. Anyị naza oku n’ekwentị n’asụsụ Bekee m’ọbụ French n’akara +1 617 450 3669, m’ọbụ degara anyị email n’asụsụ ọbụla na lecture@christianscience.com.


  • A nadọsi aka na ntị ike na tupu eme ihe ọbụla ka ebido site n’iche uche banyere ihe ndia edere nebea, na itule ya gị na ndi gị na ha so neme m’ọbụ nahazi lekchọ ahụ.

    • Iwu nile dị na Chọọchị Manual gbasara lekchọ (pp. 93-96).

    • Leta Ọdozi akụ Eddy dere Bọd nahụ maka lekchọ nke ebipụtara na First Church of Christ, Scientist and Miscellany, pp. 248-249.

    • Edemede abụa edere nso-nsoa sitere na Bọd nahụ maka lekchọ (le ihe dị n’elụ nke negosi Etu esi enweta ya).

  • Ana arịọ kwa ndi ọgbakọ nile ka ha n’ekpe ekpere ịkwadọ ihe omume lekchọ ahụ mgbe anamalite ime njikere, ka ha ga kwa niru n’enye ụdị nkwadọ ahụ nime arọ ahụ.

  • Ndi ọgbakọ ijikọta aka kpe ekpere ka ụmụ mmadụ nabata Onye nkasiọbi ahụ, ihe omume nke Eziokwu nso nke n’eweta ngbanwe na ndụ anyị, pụrụ imeghepụ ụzọ ọganiru nịhazị lekchọ, nke bụ ihe ngọsi nke Eziokwu nke n’agwọ ọrịa nime chọọchị ma nime obodo.

  • Nzụkọ ime njikere site n’ikpe ekpere nke uche nke ndi ọgbakọ unu geme pụrụ ịmịta ezi mkpuru. Gị na onye ahụ gaje ime lekchọ pụrụ ịkparịta ụka banyere ụzọ kachasi nma iji so me nzụkọ ahụ: ịbịa n’onwe ya, site n’igwe nzirita ozi, m’ọbụ ọnyọnyọ vịdeọ.

  • Gị na ndi ọgbakọ ịnwe nzụkọ ịkọwapụta mkpuru ọmịtara mgbe emesịrị lekchọ pụrụ ịbụ ohere ọma ịgba-ama banyere ọgwụgwọ ọrịa nke naga niru. Biko kọ kwara onye ahụ mere lekchọ ahụ! Ma enwere nzụkọ ma enweghị, ekpere ị nekpe newepụghị aka na nlekọta ị nelekọta ndi bịara gere lekchọ ahụ m’ọbụ ndi ọmetụtara n’ụzọ ọbụla; nlekọta dị otua bara uru nke ụkụ, ọ namịkwa mkpuru.

  • Ole ụdị mmadụ ịchọrọ ka ha ge gị ntị (ọhaneze, ndi guru akwụkwọ, ndi nọ n’ụlọ akwụkwọ dị elụ, ndi ntọrọbia, ndi aturu mkpọrọ, ogige ndi Kristen Sayensi ebe a na elekọta ndi ọrịa, ọgbakọ ana ekwu ihe banyere arụike m’ọbụ ebe ana ere akwụkwọ, ndi okpukperechi dị iche iche, na ndi ọzọ)? Ole ụzọ ndi ọzọ dị ire iji metụta ndịa nege gị ntị ma ga niru neme etua (mgbe akaemeghị lekchọ m’ọbụ mgbe emesịrị ya)?

  • Apụrụ ịhụ isiokwu aga eji eme lekchọ na “Search lectures by title” ka iwe site na ekpere họrọ nke ịchọrọ. Akụkọ ndụ ndi neme lekchọ na mgbe ha dị na njikere ime lekchọ dị na akụkọ dị nke-nke edere banyere ha na “Meet the Lecturers”. N’ịsọpụrụ ndi neme lekchọ biko kpọturu nanị otu onye otu ugboro.

  • Ndi neme lekchọ nachọsị-ike, ọdịkwa ha mkpa ka gị na ha nwe mkparịta ụka banyere ebumnuche nke eji eme ihe omume ahụ, ya bụ ihe ị neche na Chineke nakpọ gị ka imezue n’oge ahụ, ebe aganọ me ya na ụbọchị ageme ya, na ụgwọ ọbụla a gakwụ maka igere lekchọ ahụ na ihe ndi ọzọ. Mkparịta ụka nke mbụ bụ oge dị nma ịjụ ase banyere ego nke agakwụ onye ahụ neme lekchọ ahụ na ego ndi ọzọ apụrụ imefu, na ichọpụta ihe onye ahụ neme lekchọ chọrọ: ịma-atụ, tebụlụ m’ọbụ podium, ụdị igwe nzirita ozi na mikrofon, flichart, oche, na ihe ndi ọzọ. Ọgamasị onye ahụ neme lekchọ ịmata ihe ọhụ ọbụla nke pụrụ ịdapụta, ihe ndi metụtara ya, m’ọbụ mkpa nile nke ga apụta ihe oge ana ahazi lekchọ ahụ. Ha so gị ekpe ekpere kwa ụbọchị!

  • Ọge ịna ahọrọ ebe unu ga anọ me ihe omume ahụ, ọdị mkpa ịga le Etu ebe ahụ dị, tụle ma ọ ga adịrị ndi nabịa igere lekchọ ahụ mfe ịchọta ebe ahụ na ohere nke dị n’ụlọ ahụ, na ụdị ebe a nedebe ụgbọ ala enwere nebe ahụ. Ole Etu ndi bịara igere lekchọ ahụ gesi achọta ebe ahụ ma ha gba ụgbọ ala ọhaneze? Ebe ahụ ọ nabatara ka enwe ihe ama m’ọbụ sandwịch bọard na mbata ya? Ole ụdị igwe nzirita ozi dị ebe ahụ? Ọ dị ụzọ ọbụla ihe omume lekchọ ahụ gesi abụ ihe nkwalịte nye ebe ahụ m’ọbụ otu ahụ mgbe a neme ya?

  • Ọburu na arọpụtabeghị ya ebe ahụ, ịgbazịrị igwe nzirita ozi dị nma bara uru. Gbalịa were ya kwụe okwu ịchọpụta ma ọdịnma tupu ụbọchị lekchọ ahụ ma weta batịrị mara ụma!

  • CSO (Kristen Sayensi Oganizeshon) nke obodo unu nke kọleji m’ọbụ mahadum dị nso nwere ike ịchọ ịso me ihe omume ahụ! Eleghị anya ndi otu CSO ahụ nwere ike ịkwalite lekchọ ahụ n’ụlọ akwụkwọ ha m’ọbụ hazie lekchọ nke aka ha mgbe onye ahụ neme lekchọ nọ n’obodo ahụ. Alaka chọọchị m’ọbụ sosieti nile dị n’ebe unu m’ọbụ na region unu pụrụ irite uru site n’ịmata n’oge atụmatụ gị nke bụ ịkpọta onye neme lekchọ, ka ha we hazie ihe omume nke ha ma rite uru site n’iso kwụọ ụgwọ njem nke onye ahụ neme lekchọ.

  • Ole ụdị akwụkwọ unu bụ n’obi ire m’ọbụ inye nefu n’oge lekchọ ahụ? A pụrụ inwe ego dị ala a nakwụ maka izụ akwụkwọ ndi ahụ ebe ọdị ọtụtụ, ya bụ Baịbụlụ na Sayensi na Arụike na akwụkwọ nile ndi anyị nebipụta site na ọba akwụkwọ m’ọbụ site n’idega akwụkwọ na orders@csps.com.

  • Onye ahụ neme lekchọ ga enwe obi ụtọ gị na ya ịlụkọ-ọlụ mgbe ụbọchị lekchọ nerubeghị ichepụta ụzọ ziri ezi aga eji eme nkọwa.

  • Ọtụtụ ndi bịara igere lekchọ na ekele – ekele nihi ohere ịzụrụ m’ọbụ ịnata nefu Baịbụlụ na Sayensi na Arụike m’ọbụ akwụkwọ ndi ọzọ dịka akwụkwọ ọgụgụ nile ndi Kristen Sayensi bipụtara, ma lekchọ gasịa. (Anyị natụ alo na ọbụrụ na Sayensi na Arụike gadị, ka Baịbụlụ dịrịkwa.) Ọdịghị nke ụfọdụ mmadụ nwere, ọbụ kwa ihe kwesịrị ekwesị ka ndi ụka Kraist anyị me ka ha na Baịbụlụ dịrị.

  • Ọbụrụ na ọ gamasị gị inye onye ọzọ otu edemede sitere na otu nime akwụkwọ ọgụgụ anyị nwere, le anya ebe edere Inata ikike n’okwu metụtara nkea. Etu ọdị, a nekwe ka edepụta ihe ruru narị (100) edemede nanataghị ịkike. Aghaghị ịkpọ aha ebe esi depụta ha. Ọbụrụ na ịchọrọ ịdepụta karia narị (100) kọpị m’ọbụ chọkwuo ịmata ihe ụfọdụ, dega email na copyright@csps.com ka enye gị ikike.

  • Aga enye mpe mpe akwụkwọ banyere akwụkwọ nile nke Kristen Sayensi: ya bụ ọkwa banyere chọọchị ha, Ọba Akwụkwọ, christianscience.com na website nke alaka chọọchị, na lekchọ nke aga eme na ọdiniru? Ọtụtụ ndi bịara igere lekchọ bụ ndi ọhụ na Kristen Sayensi nwere nmasị ị mata etu ha ga esi kpọturu alaka chọọchị ahụ site n’ịjụ ajụjụ m’ọbụ me nnyocha on-line n’ụlọ.

  • Ihe ọzọ a geme bụ ịrọpụta akwụkwọ ndebanye aha ndi bịara igere lekchọ ahụ, ka ewe nakpọturu ndi bịara ọhụ bụ ndi bịara gere lekchọ ahụ.

Enwere ọtụtụ ozi aga agbasa na ọkwa aga ama n’obodo ọbụla. Ekwela ka ihe ọbụla gbochie gị ịkpọturu Tara Talbott n’isi ụlọ ọrụ Bọd nke nahụ maka lekchọ ka gị na ya kparịta ụka banyere ụfọdụ ihe echepụtara; dega email na talbott@csps.com m’ọbụ kpọ ya na akara ekwentị site na +1 617 450 3428.

Ụfọdụ ndi neme lekchọ nwere ihe ha ji agbasa ozi nke ha ji bịa inye alaka nile. Ọ bụrụ na ikpebie ịrọpụta nke unu, biko gị na onye ahụ neme lekchọ lụkọ – ọlụ ka ha we kwado gị n’okwu na ụdi ya tupu ede, bipụta m’ọbụ kesasịa ihe ọbụla.

N’ụbọchị lekchọ ahụ, a pụrụ inwe otụtụ ihe dị mkpa a geme nke agebu n’uche. Ikpe ekpere nkwado nihi ụbọchị ahụ geme ka ihe nile ga nke ọma, me ka elekwasị anya na nanị otu ezi onye ahụ nke namụpụta iheọma nile, ịgụnye obodo ahụ nile n’ozi nsọ ahụ, na igosipụta ịhunanya ahụ nke sitere n’uche dị etua n’ezi e nebe onye ọbụla bịara igere lekchọ ahụ nọ na onye nagafe n’ụzọ.

Ihe ndia nesochi bụ ọtụtụ alọ atụrụ ndi anwapụtaworo na ha n’enye aka ka aga echeta. Ọ ga enye aka inye ndi ọgbakọ ọlụ ndia:

  • Idozi na imechi ebe aganọ me nzukọ ahụ.

  • Ịgbara onye ahụ neme lekchọ ụgbọ ịga na ịlọta site nebe ana eme ihe omume ahụ.

  • Inwe ndi na anabata ndi mmadụ na mbata ebe ahụ, nebe a nedebe ugbọala, na ọbụna nọdụ ugbọala nile nke ọhaneze ndi dị nso.

  • Ha na onye ahụ neme lekchọ ile ma igwe nzirita ozi ahụ ọdịnma.

  • Ịrọpụta ebe ana elekota ụmụ ntakịrị.

  • Me ka enwe ndi nọ na tebụlụ edebere akwụkwọ.

  • Kọwa onye ahụ neme lekchọ otu osi nye ntuziaka.

  • Kwụọ onye ahụ mere lekchọ ụgwọ ya.

  • Nagbanyeghị na ihe omume ahụ agasiwo, nkesa na ọgwụgwọ ọrịa ka naganiru!

  • Tule ị ga leta ndi ọhụ bịara igere lekchọ ahụ, ndi idere aha ha n’akwụkwọ m’ọbụ ndi ọzọ si na obodo unu (gbakwụnye ndi nta akụkọ) ndi gị na ha nakparịta ụka n’oge ị nakwadobe ime lekchọ ahụ, ka iwe wụlịte ma me ka nmekọrịta gị na ha naganiru.

  • Ka ndi ọgbakọ nile soro nụrịa ọñụ, ọ bara uru inwe nzukọ banyere nkpụrụ lekchọ ahụ mịtara, ka agwa kwa onye ahụ mere lekchọ maka mkụrụ ahụ.

  • Site na ekpere nile ekpere, atụmatụ nile atụrụ na ịhụnanya egosịrị, ịtọwo ntọala dị-ike nke ga eme ka ngọzi dị n’ọdịniru n’ihe omume chọọchị gị nke naganiru, tịnyere lekchọ ọzọ nke aga eme n’ ọdịniru! Imela!

Ekwentị
+1 617 450 3669 (nanị n’okwu Bekee na French)

Email
lecture@christianscience.com (asụsụ ọbụla dị nma)

Ebe ana ezi ga leta
Board of Lectureship, P07-10
The First Church of Christ, Scientist
210 Massachusetts Avenue
Boston, MA 02115
USA