Search:

Kọmiti nke nahụ maka Mgbasa-ozi

Nime ụwa nke jupụtara na nsogbu okpukpere-chi na nkewa, ezi nghọta netiti ndị okpukpere-chi dị ịche iche, inwe mkwekọ netiti mba na mba nadị ka ihe rara ahụ. Okwu mkwukwasị bụ ihe jupụtara ebe nile. Ndị kwere n’okpukpere-chi dị iche iche ka ọ nara ahụ ọtụtụ mgbe ileghara ihe mere ha ji dị iche anya. Ndị nta-akụkọ ndị nekwenyeghị nokpukpere ọbụla nagụkọ okpukpere-chi nile dịka otu ihe.

Ọdachi dị ka nkea dị kwa nihe ndị mmadụ neche banyere Kristen Sayensi. Nzọ-ụkwụ nke mbụ nke neduba ninwe nghọta dị uku, dịka akwkwọ ụka nke akpọrọ Dialogue with the World si dee ya ọtụtụ afọ gara aga, nabụkarị “ịsụchasị ahịhịa nke nghọtọhie” (The Christian Science Board of Directors, 1972).

Kọmiti Kristen Sayensi nke nahụ maka mgbasa-ozi na ụwa nakparịta ụka kemgbe okpukpere-chi a malitere. Ịsụchasị ahịhịa nghọtahie nke gegbochi inwe ezi nghọta banyere Kristen Sayensi bụ isi ọlụ nke analụ nebea. Mgbe anehiwe Kọmiti a, onye chọpụtara ụka a bụ Mary Beker Eddy nyere ntụazi aka ka alụọ ọlụ “dịka ndị otu Kraịst” (Church Manual [Chọọchị Manual] 97). Ebumnuche ya abụghị ikọ akụkọ mọbụ ịkwalite ihe ndị mmadụ neche, kama ọbụ ka agba aka-ebe nye eziokwu. Mmụọ ya bụ nke ịgwọ ọrịa, ọbụghị ịkatọ ndị nekwenyeghị nokpukpere-chi a.

Edepụtara ọlụ nke Kọmiti a nalụ maka mgbasa ozi na Atikle XXXIII nime Chọọchị Manual. Ụlọ ọrụ nke onye-isi Kọmiti mgbasa-ozi nile dị na Boston, Massachusetts, USA, enwekwara ihe karịrị otu narị Kọmiti ndị nahụ maka mgbasa-ozi, ndị anarọpụta kwa arọ ka ha je ozi nobodo ha dị iche iche nụwanile. Ọlụ a nke analụ kwa ụbọchị nwere ike gụnye ide ihe, ikwu okwu, mọbụ ide akwụkwọ nye ndi ụkọ-chukwu, ndị ọka nmụta, ndị ode akwụkwọ, ndị nta akụkọ, ụmụ akwụkwọ, ndị ọlụ ahụike, na ndị ome iwu; ma nke bụ eziokwu bụ na ọlụ nke iwepụ nghọtahi nime echiche gbagọrọ agbagọ bụ ọlụ dịrị ndị Kristen sayensi nile ndị gesite n’ịhụnanya Kraịst nke dị n’obi ha nye aka ime ka enwe ezi amamihe banyere Kristen Sayensi.

Biko gakwuru Kọmiti nke dị n’obodo gị ka ị we mata etu ị gesi nye aka.

KỌMITI MPAGHARA NKE NAHỤ MAKA MGBASA-OZI