Search:

Ọgwụgwọ ọrịa n’usoro Kraịst taa

N’ọtụtụ ụzọ, ụmụ mmadụ ka nachọ ihe ahụ ha nachọ oge nile – arụike, udo, na ọdịnma nke nadịgịde adịgide. Jisọs Kraịst mezuru ọchụchọ ahụ anachọsi ike maka ezi ndụ site n’ikwusa oziọma nke alaeze Chineke, na ịgwọ ndị ọrịa, ndị obi ha tiwara etiwa, na ịkpọghachi ndị furu ụzọ. O kuziri ndị neso ụzọ ya ka ha bụrụ ndị nagwọ ọrịa n’usoro Kraịst, ma kwe ha nkwa na ọbụrụ na ha erube isi na nkuzi ya, ha galụ ọlụ karịa nke ọ lụrụ.

Gịnị nenye anyị ike ịgwọ ọrịa etu Jisọs si gwọ – mgwa-mgwa, n’ike-n’ike, n’ozuzu oke? Ọ namalite site n’inwe okwukwe dị omimi nime ịdịnma na ịhụnanya Chineke; gbakwunye inwe nghọta ime mmụọ banyere iwu nsọ nile, nke nakwagide otu onye na mmadụ nile. Sayensi nke ịgwọ ọrịa n’usoro Kraịst ka Mary Baker Eddy chọpụtara, ọ bụ kwa ya dere akwụkwọ Sayensi na Arụike nke nwere Nkpịsị-igodo eji akpọhghe ihe edere n’Akwụkwọ nsọ. Site n’oge nke ya rue n’oge nke anyị, akwụkwọ ọmụmụ-ihe a nke gbadoro ụkwụ na Baịbụlụ maka ịgwọ ọrịa n’uzọ nke ime mmụọ enyeworo ndị mmadụ aka gburu-gburu ụwa inweghachi arụike na igbochi ahụhụ. Ịkụziri ụwa nile Sayensi a nke gbasara ụwa dum nịme nkpa nakpa ha bụ ọlụ naga niru nke Chọọchị a nalụ.

Anyị nakpọ gị ka i nyocha ọgwụgwọ ọrịa nke Kristen Sayensi ta. Ị gahụ etu ndị mmadụ dị ka gị siri were usoro ekpere a dị irè merie ihe ịma-aka nile nke ndụ.

Lekchọ online

Mata etu Kristen Sayensi si agwọ ọrịa site na lekchọ nke aneme online, mọbụ nke anahụ onye neme ya iru na iri gburu-gburu ụwa.

Ọtụtụ ihe (n’okwu Bekee)

Sonye na ọgbakọ nke ndi otu ya nọ nebe niile n’ụwa

Mata ma me ka ndi ọzọ mata iheọma nke dịrị madụ niile site n’isoro ndi ọzọ bụrụ onye ọgbakọ. Otu n’ime ngọzị ndi ana-enweta n’ịbu onye ọgbakọ nke The Mother Church.

Ọtụtụ ihe