Search:

Ọnọdụ eji hazie ya – etu esi kpebie iwere ya lụọ ọlụ

Malitere ikpeazụ na Mee 30, 2017

Enyere gị ike imehe Christianscience.com bụ (Saịt ahụ) nke ndị nwe ya na ndị neme ka ọ nalụ ọlụ bụ The First Church of Christ Scientist dị na Boston, site na njikọta aka nke ha na The Christian Science Publishing Society (TFCCS). Site n’inyocha ihe dị na Saịt a, ọ pụtara na ị nabatawo ma kwere n’uju “Terms” (Ọnọdụ iwu) nile emere eji hazie ya n’okwu Bekee ya na “Privacy Policy” (Usoro iwu nke Onye Ọgbasara) ma “Permissions” (Ikike) Saịt a edere n’okwu Bekee site na Ọnọdụ iwu. Edemede ndị ahụ edere n’okwu mkpebi nile eji hazie Saịt a, na okwu banyere ebumnuche nke ndị nwe ya ka atụgharịworo site n’edemede mbụ ya nke dị n’asụsụ Bekee we kwupụta ya nebea ime ka ọ dịrị gị nfe ịghọta ya. Ọbụrụ na i nwere ajụjụ banyere etu esi kpebie iwere ya lụọ ọlụ, biko detara anyị akwụkwọ na info@christianscience.com.

I kwerewo kwa na TFCCS nwere ikikere ịgbanwe Ọnọdụ iwu ndịa oge ọbụla ma me ka ị mata banyere mgbanwe ndịa site nidepụta ha nime Saịt a. Mgbanwe ndịa gamalite ịdị ire abalị iri na anọ mgbe edepụtasịrị ha. Ị kwesịrị ịtụle ọnọdụ ndịa tupu i meghe Saịt a.

Ịnata ikike ịkọpịrị ihe edere nime ya

Ihe ọbụla dị na Saịt a, dịka okwu edere ede, onyonyo esere ese, okwu anege na ntị, mọbụ ihe nlere anya, (Ihe ndị dị na ya), bụ ihe TFCCS mọbụ ndị nedebatara ha akwụkwọ nwe. Saịt a na ihe dị na ya bụ ihe iwu nchekwa nke uwa nile chekwara.

TFCCS nenye gị ikike nọnọdụ ụfọdụ idegharị mọbụ ibipụta ihe dị na ya ọbụrụ na iwu nke nachị Saịt a kwere ka i me etua, kama ọ bụ nanị ka i jiri ya we lụọ ọlụ, ọbụghị ịtụ mgbere ahịa. Biko rịba ama na “iji ya lụọ ọlụ” agụnyeghị ikesa ihe dị na ya, dịka iwere edemede, mọbụ onyonyo dị na ya tinye nihe egwuri egwu ọbụrụ na iwu nke nachị Saịt a enyeghị gị ikikere. Ịgaghị ere, bipụtagharịa, kesasịa, mọbụ wepụta nụdị ọbụla ihe dị na Saịt a nenwetaghị ikikere agenye gị site nidetara gị akwụkwọ.

Biko hụ ntụpe nke edere ihe banyere ịnata Ikike (n’okwu Bekee) ka ị hụ ntụzi-aka enyere banyere etu esi arịọta ikike maka iwere ihe dị na Saịt a me ihe ọzọ.

Akara azụm ahịa

Akara nke Cross & Crown (Obe na Okpueze) nke eji mara “Christian Science”, “Kristen Sayensi”, njirimara ndị ọzọ, logos, na onyonyo nile dị na Saịt a, bụ nke TFCCS na ndị nedebatara ha akwụkwọ, apụghị kwa iwere ha me ihe nanataghị ikike. Hụ ntụpe nke Obe na Okpueze (n’okwu Bekee) banyere etu esi anata ikike iwere ya me ihe. “Kristen Sayensi” bụ njirimara iwu chekwara nke nanị TFCCS nwe.

Ụdị nmekọrịta nke mba ụwa mọbụ otu obodo na ibe ya nenwe nime Saịt a

Igwe kọmpita ayị nile, mọbụ ụfọdụ nime ha, na nke ndi nedetere anyị akwụkwọ, ka agenwe ike jikọta ọnụ nime United States mọbụ notu akụkụ obodo ahụ. Nnabata anabatara gị ka ị sonye neyocha webSaịt a pụrụ ime ka data gị gbasa n’ụwa nile, ọbụrụ na obodo dị iche iche ekwere iwere nrube-isi sọpụrụ iwu nile nachị akparamagwa na onyonyo igwe kọmpita mgbe i nenyocha Saịt a, mgbe ị nanabata kwa ihe edere nime ya nusoro kwesịrị ekwesị nke mgbasa ozi data.

Iwu nke apụrụ itinye n’ọlụ

Ọnọdụ nghọtahie ọbụla nke pụrụ ịdapụta mgbe anenyocha Saịt a ka iwu Commonwealth nke Massachusetts na nke United States gelebara anya nagbanyeghị iwu ndị ọzọ.

Ebe ha sitere

Ahịrị okwu nile nke Baịbụlụ nke etinyere akara:

  • Nsọ nime saịt a sitere na Baịbụlụ Nsọ nke Bible Society of Nigeria bipụtara

  • ma KJV ọ bụ site na Baịbụlụ Nsọ nke King James Version.