Search:

Etu esi enyocha saịt a n’usroro iwu nke onye ọgbasara

Emelitere ikpeazụ na Septemba 22, 2021

Hụ Okwu banyere Ihe-onwe (nke asụsụ Bekee) nke anyị wepụtara ọhụ n’ọnwa Mee 25,2018.

Iwu nke nachị Saịt nke otu onye nwe so na Ọnọdụ eji hazie ya (Ọnọdụ iwu) nke Christianscience.com ya bụ saịt ahụ nke onye nwe ya na onye neme ka ọ nalụ ọlụ bụ The First Church of Christ, Scientist, nke dị na Boston, ya na The Christian Science Publishing Society nke ya na ya jikọtara aka bụrụ (TFCCS). Site n’inyocha Saịt a i kwerewo n’okwu ya nile, na iwere ozi dị na ya me ihe dịka akọwara n’usoro iwu nke Onye Ọgbasara.

Ole ozi nke anyị newere?

“Data nke otu onye” pụtara ozi nke anyị pụrụ ịchịkọta, hazie, ma were ya lụọ ọlụ dịka o metutara gị onwe-gị mgbe ị nenyocha saịt a.

  • “Ozi nke idebanye aha” pụtara ozi ahụ i nezipụ (n’aha gị, na njirimara gị, na address e-mail gị) mgbe i nenyocha ozi nile nke dị na saịt a, dịka ozi e-newsletter, mobụ mgbe i nenye onyinye ego.

  • “Mgbasa ozi banyere etu esi eresị ndị nazụ ahịa ihe” pụtara ozi nke i nezi anyị banyere etu saịt a si alụ ọlụ.

  • “Ozi nke ezibatara” pụtara ozi nke browser gị nezipụ mgbe i nenyocha saịt a, (dịka ozi IP na ozi ndị ọzọ dị mkpa, nke i nezipụ n’ụbọchị na n’oge ndị ahụ ị nanwale ịmara ma akara eji achọ ihe nke dị na kọmpita gị ọ nalụ kwa ọlụ). Data anyị n'edetu Ozi ọbụla ezibatara.

Ole etu anyị gesi were ozia me ihe, gịnị kwa ka anyị geji ya we me, ruo ole mgbe ka anyị gedebe ya?

Ka ewe nye gị ọmụma ihe dị ire, mobụ kwanụ ka ewe mezuo ihe iwu chọrọ, i kwerewo na anyị nwere ikike iwere ozi nke akọwara n’ụzọ iwu nke Onye Ọgbasara me ihe n’ụzọ dị etua:

  • Gwa gị gbasara mmelite Saịt ma nyochaa njirimara gị

  • Ọbụrụ na inyere TFCCS email gị, site na Saịt a, TFCCS nwere ike ịdị nezitere gị ozi banyere TFCCS na ndị ya na ha nemekọ ihe site na email gị, ozi banyere edemede ha na ihe omume ha. Ozi email ahụ gbakwunye kwara etu ịgesi kwụsị mgbe ị chọrọ ịrapụ ịtụ mgbere ahịa. Ị pụkwara ịkwụsị site na ikpọturu info@christianscience.com.

  • Agalụrụ gị ọlụ dịka onye ahịa ma nye gị nkwado ọbụla ị chọrọ

  • Aganamanye etu ahụ esi kpebie iwere ya lụọ ọlụ, dozie esem-okwu ọbụla, na nsogbu ọbụla nke dapụtara adapụta

  • Me ka Saịt ahụ dịwanye nma, ma ihe dị nime ya na usoro esi hazie ya

  • Agedebe iwu nile, usoro nile, usoro iwu nile, mọbụ ihe ọbụla ọchịchị obodo chọrọ

  • Aga agba mbọ ịchọputa, igbochi, mọbụ ihichapụ aghụghọ, me kwa ka okwu banyere nchekwa na ịchọta ezigbo ngwa-ọlụ sie ike

  • Agahụ na egbochiri ihe ọbụla chọrọ imebi TFCCS, ịnapụ ya oke ruru ya, imebisị mgwa-ọlụ ya, mọbụ iwetara ya ọdachi, otu ihe ahụ nebe ndị nenyocha Saịt a nọ, na nebe ọha na eze nọ kwa.

Anyị nwere ike nejigide Data Gị dịka ọ dị mkpa ka ewere ya nemezu ebumnuche ọma nile dị na Saịt a nusoro iwu nke Onye Ọgbasara.

Nagbanyeghị etu ọbụla o si dị nime iwu nke Onye Ọgbasara, anyị nwere ikike ịchịkọta ozi gị nile, ma ozi nke gbasara onwe-gị nke ayị natara naka gị mgbe inenyocha Saịt a, na ozi ndị ọzọ ị natara mgbe gị na The First Church of Christ, Scientist nemekọ ihe, na ndị ọlụ ya nile , na ndị nejere ya ozi, na etu isi atụ mgwa-ahịa, na etu ị si azụ mgwa-ahịa, na etu ị si ga na web saịt, mọbụ nmekọ ndị ọzọ dị iche iche notu ebe. Anyị nwe kwara ikike isite n’ozi a me ka ihe nile, dịka ịma-ọkwa, na ihe ndị ọzọ nke ị hụworo na Saịt a mọbụ na saịt ndị ọzọ anyị nwere me ka ozi ndịa bụrụ nke aka gị, ma neme kwa ka ozi ọbụla ị zitere rute ndị ọzọ anyị na ha nemekọ ihe, mọbụ ndị nalụrụ anyị ọlụ, iji kwalite Saịt a, mọbụ nwe ike gbasa ozi, mọbụ soro gị kwurịta okwu, nihi ọdịnma nke gị.

Anyị nwekwara ike iji ozi gị dịka akọwapụtara n'okpuru.

Usoro esi Ewebata ihe

Ọbụrụ na ịchọ isite na Saịt a webata onyinye ego, anyị nesite naka ndị ọzọ ndị nahụ maka inabata ego we nahazi ego ọbụla ị nakwụbata, nọnọdụ dị etua ọbụ ndị ọlụ ego ahụ ka ịnezi ozi gị.

Agaghị eme ka ndị ọzọ nkea ngbasaghị mara ihe banyere ihe ọbụla ị webatara iwere ya tụọ mgbere ahịa nebughị ụzọ nata ikike naka gị. Anyị nwere ike were email nakọrọ gị ihe nile gbasara Saịt a, banye kwara edemede anyị nile na ihe ndị ọzọ nile anyị neme. Inwere ike ịkwụsị ịnara ozi email a mgbe ọbụla ịnachọghịzi ya site nakara link ahụ eji ezitere gị ozi.

Nzirita ozi nke anyị na Ndị ahịa

Anyị nwere ike iwere ihe ikwuru, mọbụ ntụzi-aka ị nyere m’ọbụ ntunye uche ndị ọzọ we me ka Saịt a dịwanye nma. Anyị nwe kwara ike were ozi nke anakpọghị aha onye zitere ya we tụọ mgbere ahịa; iji ma atụ, idepụta ọnụ-okwu ndị ahụ na Saịt anyị mọbụ nigwe nzirita ozi ndị ọzọ bụ okwu ndị ahụ anamaghị onye kwuru ya. Anyị agaghị eme ka onye ọzọ mara ihe banyere ozi ọbụla nke ị zitere mọbụ nke ị zighachiri nke gbasara nanị gị onwe-gị, mọbụghị ma ị nyere anyị ike ime etua.

Ozi banyere etu esi etinye ihe

Anyị newere Ozi Ezibatara me ka onye nenyocha saịt a nwe nmụta pụrụ iche, were kwa ya neme mgbakọ na ọnụ-ọgụgụ.

Onye ka anyi nezigara ozi nke gbasara gị onwe-gị?

Anyị adịghị eresị, mọbụ zipụ ozi ndebanye aha gị nye ndị ọ nagbasaghị, mọbụghị ma ịnyere anyị ike ime etua, mọbụ kwanụ nanị na iwu ọ chọrọ ka eme etua.

Ịtụ mgwa ahịa, ire ngwa-ahịa, na inye onyinye ego bụ ihe ndị ọzọ, ndị ọ bụ ọlụ ha, nalụ n’aha TFCCS; ọ bụ kwa ndi dị etua nanakọta, ma nechekwa ozi nile gbasara ego na credit card nanị nihi ka ha we hazie azụm-ahịa dị etua. Enwere ike izigara ndia nahazi azụm-ahịa ozi ndebanye aha ahụ nke ịzigara TFCCS ka ha we nwe ike ilụrụ gị ọlụ. Aneme ka ị mata, dịka ha mere ka anyị mata, na saịt a bụ ihe nke oge a iji chọpụta onye ị bụ nezie; otu aka ahụ kwa, ewepụ ozi banyere (Kredit kad), ozi nke onwe nke ị nezibata na saịt a ka anyị geji me ihe ịhụ na saịt a nalụ ọlụ nke ọma, ma ọ gabụrịrị n’usoro iwu nke Onye Ọgbasara ka ageji ya we nalụ ọlụ nile.

TFCCS nwere ikike ịchịkọta data ndị gbara ọkpụrụkpụ nke anedepụtaghị aha ndị nwe ha were ha lụọ ọlụ nzisa ozi maka ịkwalite saịt a na ime ka ọ dịwanye nma.

Site ninyocha Saịt a ọ pụtara na ị nabatawo ozi nile anyị chịkọtara ma hazie na United States, mọbụ n’obodo ọzọ ebe anyị nọ, mọbụ nebe ndị anyị na ha nlụkọ ọlụ nọ, mọbụ kwanụ nebe ndị nedebatara anyị akwụkwọ nọ bụ ndị nwere ihe ha ji alụ ọlụa.

Ole etu anyị gesi chekwa ozi nke gbasara gị onwe-gị nke izitere anyị?

Anyị nakpachara anya n’ọlụ, na iwere ezigbo ngwa-ọlụ, na ịghọrọ ndị nche mụ anya iji gbochie onye nekwesighị ekwesị ịbata n’ozi ahụ, ka ọ ghara imebi ya, mọbụ gbanwe ebumnuche ya; mgbe anyị mesịkwara ihe nile gbasara ozi ahụ anyị adịghị edebe kwa ya ọzọ iwere ya nalụ ọlụ etu iwu nakwadoghị. Nagbanyeghị mbọ nile anyị nagba ọdịghị nchekwa ọbụla zuru oke kpam kpam. Nihi nkea anyị agaghị ekwe mkwa na onye ọzọ agaghị enwe ike imepe ozi Ndebanye aha ahụ nke ị zibatara, nihi ya ikwenyewo na agaghị agba anyị akwụkwọ ọbụrụ na onye ọzọ ekpughe ozi gị.

Ọ bụ oke na ọlụ gị ichekwa na idozi akara ndị iji anata ozi ime ka ọ bụrụ ihe nzuzo. Ịgaghị eme ka onye ọzọ mara aha mọbụ akara iji anata ozi mgbe ọbụla ị mechara ihe n’ozi gị. Ihe ọbụla nke mere n’akwụkwọ ozi gị dị gị n’aka.

Ole etu anyị si ewere cookies eme ihe?

Anyị neji cookies ekewapụta akụkọ onwe banyere etu onye nabịa na Saịt a gesi nenyocha ya, na ugboro ole ọ bịara. Ụfọdụ akụkụ Saịt nwere ike ghara ịlụ ọlụ nke ọma ọbụrụ na idebe browser gi etu ọ geme ka ike gwụ cookies. Ịgahụ ọtụtụ ihe edere online nke gakọwara gị etu cookies si alụ ọlụ.

Ogologo oge ole ka ibu ọrụ anyị dị?

Iwu nke Onye Ọgbasara metutara nanị ozi Saịt a natara. Anyị adịghị enye ndị ọzọ iwu etu ha gesi lụọ ọlụ na website nke ha. Gbakwunye na nkea, Saịt a nwere ihe jikọtara ya na saịt ndị ọzọ anyị na ha nenwe nmekọ, ndị nwere usoro iwu onye ogbasara nke ha, dịka Christian Science JSH-Online (Herald-Online), na MaryBakerEddyLibrary.org.

Ndị nenyocha Saịt a site n’obodo ọzọ nabụghị United States

Ehiwere Saịt a na United States, ọ bụ kwa iwu United States nachị ya. Ọbụrụ na ị nenyocha saịt a site nebe ọzọ nabụghị United States biko buru n’uche na enwere ike ibuga data gị, chekwa ya ma were ya nalụ ọlụ na United States ebe server anyị dị na ebe eji kwa database anyị nalụ ọlụ. Mgbe inenyocha Saịt a ị kwerewo na apụrụ ibuga data gị nebe mgwa-ọlụ anyị dị, na nebe mgwa-ọlụ ndị otu anyị dị kwa bụ ndị anyị na ha nalụkọ ọlụ, dịka akọwara niwu nke Onye Ọgbasara.

Ụmụaka

Emeghị Saịt a maka ndị nerubeghị arọ iri-na-atọ, (13). Dịka iwu Children’s Online Privacy Protection Act (nke anakpọ COPPA) si dị, Saịt a adịghị akpachara anya anabata ozi nke ụmụaka zibatara bụ ndị nerubeghị arọ iri-na-atọ nanataghị ikike naka ndị mụrụ ha. Ọbụrụ na amata na anabatara ụdị ozi ahụ nke ndị mụrụ ha namaghị maka ya, agehichapụ ozi ahụ mgwa mgwa site na database Sait a, m’ọbụ akpọturu onye mụrụ nwata ahụ ka o nye nkwado.

California Adighị Achọpụta Ozi zoro ezo

Ka ọdị ugbua Christian.Science.com adịghị anabata ntụzi-aka ahụ nke nasị, ACHỌPỤTAKWALA nke anakpọ (DNT).

Enwere ike imegharị iwu a bụ iwu nke Onye Ọgbasra?

TFCCS nwere ikikere imegharị iwu nke Onye Ọgbasara mgbe ọbụla. Biko nenyocha ntụpe akwụkwọ nkea oge nile ka ị mara mgbe ọ gbanwere. Anyị gedepụta mgbanwe ọbụla emere banyere Iwu nke Onye Ọgbasara na ntụpe akwụkwọ nkea. Mgbanwe ọbụla emere gamalite ịdị ire mgbe abalị iri-na-anọ gasịrị.

Ole oke ruru gị, ole kwa etu igesi kpọturu anyị?

Ọbụrụ n'ịchoro iwere oke ruru gị site n’inyocha, idegharị, imejupụta, m’ọbụ iwepụ Data Gị, biko kpọturu anyị na info@christianscience.com.