Nyocha:

... ma le, kpakpando ahu, nke ha huru n'ọwụwa anyanwụ, ọ naaga n'iru ha, rue mb͕e ọ biara guzo n'elu ebe nwatakiri ahu nọ.  

Matiu 2:9 ma le 

Eduuru ndị amamihe ahụ ka ha hụ ma soro kwa kpakpando ụtụtụ nke Sayensị nke n'eduba n' udo ebighị ebi.     

Sayensi na Arụike nke nwere Nkpịsị-igodo eji akpọghe ihe edere n’Akwụkwọ nsọ, nke Mary Baker Eddy dere, ntụpe vii

Gịnị bụ Kristen Sayensi?

Inwere ike ịmepe mpe-mpe akwụkwọ anyị nke nasị “Gịnị bụ Kristen Sayensi?” Ọ genye gị nmalite ozi banyere Chineke na etu esi etinye Kristen Sayensi n’ọlụ, kọwa kwara gị ihe banyere The First Church of Christ, Scientist, na edemede ya nile

Ọtụtụ ihe

Ịgwọ ọrịa n'usoro Kraịst taa

Lee etu ndị mmadụ gburugburu uwa si dabere n'usoro ekpere a nke dị ire iji zute ihe nile nama mmadụ aka nime ndụ ya.

Ọtụtụ ihe

Edemede nile na ihe omume nile

Muo ihe-ọgụgụ nile, akwụkwọ nile ebipụtara ebipụta, na ihe omume nile ndị neme ka anyị mara ihe, nke nakpọlite echiche anyị, bulie anyị elu, ma mee ka nghọta anyị nwere banyere ọgwụgwọ ọrịa ime mmụọ dịwanye omimi.

Ọtụtụ ihe

Kọmitii Kristen Sayensi nke nahụ maka Mgbasa-ozi

Chọpụta etu Kọmitii a nahụ maka Mgbasa-ozi si alụ ọlụ ka ị wee mara ụzọ o si metuta gị.

Ọtụtụ ihe