Search:

Ọmụmụ ihe nke Baịbụlụ

Baịbụlụ bụ ntọ-ala nke usoro ọlụ Kristen Sayensi. Sayensi na Arụike nke Mery Baker Eddy dere nenyocha iwu ime mmụọ nke bụ ihe ndabere banyere ọgwụgwọ ọrịa na mmụnwe nke Baịbụlụ nenye, na etu agesi were ya gbo mkpa nile nakpa mmadụ.

Ụmụ-akwụkwọ Kristen Sayensi nagụ Ọmụmụ ihe Baịbụlụ nke izu-ụka, nke anebipụta na Christian Science Quarterly [Kwọtali], ọ nerute kwa onye ọbụla aka online mọbụ n’Ọba Akwụkwọ nile nke Kristen Sayensi. Izu-ụka nile ihe ọmụmụ ọhụ nke nwere ahịrị sitere na Baịbụlụ, site kwa na Sayensi na Arụike neme ka e nwe echiche nke nagwọ ọrịa nke apụkwara itinye n’ọlụ iji gbo ọtụtụ nsogbu nke mmadụ nagabiga kwa ụbọchị. Eziokwu ime mmụọ ndịa ka enwere ike itinye n’ọlụ n’ụzọ dị ire iji kwa gbochie ọtụtụ ihe metutara ụmụ mmadụ, dịka mpụ, nsogbu banyere ogige ebe mmadụ bi, agha, na ụbịam.

Izu-ụka ọbụla mmadụ abụa ndị Ọgụ-ihe nagụpụta ya dịka oziọma nke ụbọchị ụka na Church of Christ, Scientist gburugburu ụwa nile. Iji nghọta we nege ntị n’ihe ọmụmụ Baịbụlụ neme ka enwe ike tinye echiche nile enwetara n’ọmụmụ ihe ahụ n’ọlụ; ọ nenye aka ime ka onye ọbụlụ nọ nebe ahụ n’oge ahụ rite uru site nịnata ọgwụgwọ ọrịa, ọ naba kwara obodo uru. Ihe-ọmụmụ Baịbụlụ bụ ihe dị mkpa nke mejupụtara ihe anakụziri ụmụntakịrị ndị ntoroọbịa nime Kristen Sayensi Sọnde Skool nile.

Ihe ndị ọzọ gbasara Ọmụmụ-ihe Baịbụlụ

Chọpụta ihe ndị ọzọ gbasara Ihe-ọmụmụ Baịbụlụ ndị ebipụtara ebipụta na ndị nke digital ndị edere nọtụtụ asụsụ dị iche iche.

Nyocha Ihe-ọmụmụ Baịbụlụ (n’okwu Bekee)