Search:

Ime ngwado ịbụ onye ọgbakọ

Ịbụ onye otu nke ọgbakọ ọbula ndi nalụkọ ọlụ inwetazu ihe ọbụla bụ itinye uchu, ya bụ nke neme ka ịbata n’ọgbakọ ndi n’eche otu echiche.

Ịbụ onye ọgbakọ nke The Mother Church bụ ihe dị uku ri nne. Ị na-esonye n’ọgbakọ nke dị gburu gburu ụwa nke nemejupụta gị n’ụzọ nke ime mmụọ, na-agọzi gị, ezinụlọ gị na ndị enyi gị, na ụwa niile.

Inwere ike n’eche echiche ime nkea nihi na ịghọtawọ uru Kraist Sayensi bara nke Mary Baker Eddy chọpụtara. Inwere ike ịhụ ka agụụ nagụsị ụwa ike ịnweta ndụ ahụ nke n’enye ojuju afọr n’ezie; inwe kwara ike ịchọ ya maka onwe gị ma nyere ndi ọzọ aka ịchọtakwa ya. Eleghi anya ịhụwo ọlụ ọgwụgwọ nke Kristen Sayensi n’agwọ, ikekwe onwere ike bụrụ na gị onwe gị enwetawo ọgwụgwọ m’ọbụ gwọ ndị ọzọ.

Na nke nke, ikwere na nnwere onwe na ọbị ụtọ nke nesite na nghota ime mmụọ dị ike banyere Chineke na-enye ojuju afọ dịka ihe ọzọ ọbụla napụghị inye. Ichọkwara iso ndi ọzọ ndi nwere nmetụta dị etua. Anyị chọrọ inyere gị aka! 

Manual of The Mother Church [Akwụkwọ ntuziaka nke The Mother Church] (pp. 34–35) n’enye ntuzi aka etu esi etozu oke ịbụ onye ọgbakọ:

ỊBỤ ONYE ỌGBAKỌ

Edemede nke Anọ

IHE NDI NEME KA ETOZUO OKE ỊBỤ ONYE ỌGBAKỌ

Kwere na Kristen Sayensi.  Agba nke mbụ. Iji bụrụ onye ọgbakọ nke The Mother Church, The First Church of Christ, Scientist, nke dị na Boston, Massachusetts, onye ahụ nke detara akwụkwọ g’abụrịrị onye kwenyere na ozizi niile nke Kristen Sayensi, dịka atụmatụ na nkuzi nke dị nime akwụkwọ ọmụmụ ihe Kristen Sayensi, bụ Sayensi na Arụike nke nwere Mkpisi Igodo eji akpoghe ihe edere na n’akwụkwọ nsọ, nke Rev. Mary Baker Eddy dere sịrị dị. Baịbụlụ ya na Sayensi na Aruike na akwụkwọ ndi ọzọ Odoziaku Eddy dere, g’abụ nanị akwụkwọ ọmụmụ ihe ya nke ọ ga-eji akuziri onwe ya ihe na Kristen Sayensi, na iji kuzie na ịlụ ọlụ nke iji uche agwọ ọrịa.

Ọgaghị abụ onye otu ọgbakọ okpukperechi ọzọ. Agba nke Abụa. Chọọchị a ga-anabata onye ọgbakọ nke Church of Christ, Scientist ọzọ, ma ọgaghị anabata onye otu chọọchị ọzọ rue mgbe onye ahụ kwụsịrị ịbụ onye ọgbakọ ahụ.

Ụmụntakịrị ndi gbara Arọ iri na Abụa. Agba nke Atọ. Ụmụ ntakịrị ndi agbara arọ iri na abụa, ndi akwadoro, na ndi otu n’ime ụmụ akwụkwọ Odoziakụ Eddy ndi nerube isi tinyere aka ha n’akwụkwọ ya, m’ọbụ onye nduzi, M’ọbụ nwata akwụkwọ nke Ụlọ ọrụ nahụ maka ikuzi ihe, ka apụrụ ịnabata ịbụ onye ọgbakọ nke The Mother Church.


Church Membership

Article IV

Qualifications for Membership

Believe in Christian Science.  Section 1. To become a member of The Mother Church, The First Church of Christ, Scientist, in Boston, Mass., the applicant must be a believer in the doctrines of Christian Science, according to the platform and teaching contained in the Christian Science textbook, Science and Health with Key to the Scriptures, by Rev. Mary Baker Eddy. The Bible, together with Science and Health and other works by Mrs. Eddy, shall be his only textbooks for self-instruction in Christian Science, and for teaching and practising metaphysical healing.

Free from Other Denominations. Sect. 2. This Church will receive a member of another Church of Christ, Scientist, but not a church member from a different denomination until that membership is dissolved.

Children when Twelve Years Old. Sect. 3. Children who have arrived at the age of twelve years, who are approved, and whose applications are countersigned by one of Mrs. Eddy’s loyal students, by a Director, or by a student of the Board of Education, may be admitted to membership with The Mother Church.

Ịdị na njikere ideta akwụkwọ?

Chọta mpe mpe akwụkwọ nke ikwesiri iji de ya

Echiche ndi ọzọ aga-atule

Baịbụlụ Nsọ

  • Ihe ekwuru banyere Onye ọzụzụ atụrụ (Jeremaia 3:15)

  • Kraist na Chọọchị (Matiu 16:16–18)

Science and Health with Key to the Scriptures [Sayensi na Arụịke nke nwere Mkpịsị Igodo eji akpọghe ihe edere n’Akwụkwọ Nsọ] nke Mary Baker Eddy dere

  • Nkọwa enyere banyere Chọọchị (p. 583:12–19)

  • Oriri nsọ nke ime mmụọ (p. 35:19–25 nke abụọ Our)

  • Ozizi nke tọrọ ntọala (pp. 330:8–340:3)

Miscellaneous Writings 1883–1896 nke Mary Baker Eddy dere

  • Iwu akwụkwọ ntuziaka na Manual [Akwụkwọ ntuziaka] (p. 148:8)

  • Onye ọzụzụ atụrụ nke dị n’ụdị abụa (p. 322:10–15)

Manual of The Mother Church [Akwụkwọ ntuziaka nke The Mother Church] nke Mary Baker Eddy dere

  • Ịbụ onye Chọọchị (pp. 34–39; 109–112)

  • “Iduzi ndi Ọgbakọ” (pp. 40:4; 41:19; 42:4; 44:12–19 to ;)